NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

UMI EDEMEDE

Asusu obula di n’uwa nwere olundi e jiri mara ya. Asusu Igbo, dika otu n’ime asusu ato e nwere na Naijiria nwere olundi di iche iche ma nwekwaa Igbo Izugbe e jiri mara obodo niile na-asu asusu Igbo. N’edemede nchocha a nke isi okwu ya bu Ntulerikota olundi Achi na nke Igbo Izugbe, e lebara anya n’olundi Achi iji choputa myiri na ndiiche di n’etiti ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha malitere site n’inye nkowa banyere ebe isiokwu a gbadoro ukwu. E nyere nkowa banyere olundi na Igbo Izugbe putara. A kowakwara abumnobi nchocha a nke gunyere ikwalite asusu Igbo. E metutakwara aka n’uru di iche iche nchocha a baara nwanchocha, umuakwukwo, ndinkuzi ndi ga-agu ya n’odinihu na ndi ga-eme nchocha nay a tinyere ndi nwere mmasi n’asusu Igbo. Nihi na nchocha nke e mere bu nke sovee, nwanchocha gara n’ogbe iri na abuo di n’Achi gbaa ndi okenye ajuju onu. E kere ndi maara aguede akwukwo ajuju nke ha zakwara. A kowakwara maka okere nchocha ebe a noro kowaputa na o bu naani Igbo a suru asu ka agbadokariri ukwu ihi choputa ihe digasi mkpa banyere olundi Achi. E deputakwara ajuju niile a juru ndi e jiri mee nchocha kesaa ha nye ndi nwere ike igu ha dika nid nkuzi na umuakwukwo. E ziputakwara otutu nnyocha ihe e derela banyere isiokwu nakwa nnyocha edemede nchoputa bu ndi e sitere n’akwukwo agumagu di iche iche e biputara ebiputa nwetasia nwanchocha lebakwara anya n’ihe gbasara usoro nchocha e mere bu ebe o noro wee rutu aka n’ihe e banyere udidi nchocha ebe ndi a noro mee chocha, ndi e jiri mee nchocha, nsere na usoro nsere nchocha, ngwa oru di iche iche e jiri mee nchocha. E tuchara ihe niile a choputara banyere olundi Achi ma tulerikota ya na Igbo Izugbe. Nwanchocha mechara chikota ihe niile o mere na nchocha a, tunyekwuo aro eti a ga-esi site n’ileba anya n’olundi di iche iche e nwere n’asusu Igbo mee ka asusu Igbo were onodu ua dike asusu tozuru etozu.

Disclaimer: By purchasing this Research Project Material, YOU agree to use it ONLY as a GUIDE to conduct your own academic research.